Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Kọlọsị 3:23
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Kọlọsị 3:23
Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.
N’ọnọdụ ya
20Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.
21Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.
22Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi.
23Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.
24Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị kwadobere inye unu, ndị ya. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị Kraịst ka unu na-ejere ozi.
25Onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ nʼihi ihe ọjọọ niile o mere. Nʼihi na ile mmadụ anya nʼihu adịghị ya.
N’asụsụ Bekee
Whatever you do, work at it with your whole being, for the Lord and not for men,Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.Ruberenụ ha isi, ọ bụghị naanị ka unu nata ihuọma ha mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama dị ka ndị ohu Kraịst, ndị na-eme uche Chineke site nʼobi ha. Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị mmadụ.Ọ bụrụ na anyị adịrị ndụ, anyị dị ndụ nye Onyenwe anyị; ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị nwụrụ nye Onyenwe anyị; ya mere ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Onyenwe anyị.Nʼime ihe niile o mere, nke metụtara ije ozi nke ụlọ ukwu Chineke, na idebe iwu niile na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere, Hezekaya ji obi ya niile gbasoo Chineke. O jikwa obi ya niile jee ozi niile o jere. Nke a mekwara ka ihe gaara ya nke ọma.Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga.Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu.Werenụ onwe unu nyefee, nʼihi Onyenwe anyị, nʼokpuru ọchịchị niile e guzobere nʼetiti ụmụ mmadụ, ma ọchịchị ahụ ọ bụ nke eze, dịka onye ike ya kacha nke ibe ya,Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike