Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Galeshịa 5:19–21
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Galeshịa 5:19–21
19Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko.
20Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.
21Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.
Gụọ isi ahụ dum: Ndị Galeshịa 5
N’ọnọdụ ya
16Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ.
17Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime.
18Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nʼokpuru iwu.
19Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko.
20Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.
21Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.
22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi,
23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.
24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe.
N’asụsụ Bekee
The acts of the flesh are obvious: sexual immorality, impurity, and debauchery; idolatry and sorcery; hatred, discord, jealousy, and rage; rivalries, divisions, factions, and envy; drunkenness, orgies, and the like. I warn you, as I did before, that those who practice such things will not inherit the kingdom of God.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko, ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke.Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị). Ọ bụkwa nʼihi ihe ndị a ka ọnụma Chineke na-abịakwasị ndị ahụ na-enupu isi. Ihe ndị a bụ ihe unu na-eme nʼoge gara aga mgbe unu na-adị ndụ nʼime ha. Ma ugbu a bụ oge iwezuga ihe ndị a niile na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu niile, ya na okwu ihere niile na-esi unu nʼọnụ na-apụta.Ma ihe si mmadụ nʼọnụ pụta na-esi ya nʼobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ. Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu.Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke. Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ. Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ha anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ, nʼihi nke a ha na-ekwutọkwa unu.Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.”Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ. Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele. Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke. Unu ekwela ka onye ọbụla jiri okwu efu duhie unu. Ọ bụ nʼihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị na-anaghị erubere ya isi.Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi.Nʼihi na unu na-adị ndụ dịka ndị bi nʼụwa, ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nʼetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dịka ndị ụwa, dịka ndị mmadụ efu nọ nʼụwa.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike