Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Kọrint 10:13

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Ndị Kọrint 10:13

O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Kọrint 10

N’ọnọdụ ya

10Ka anyị hapụkwa itamu ntamu dịka ụfọdụ ha mere ma bụrụ ndị Mmụọ ozi ọnwụ tigburu.

11Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso.

12Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda.

13O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya.

14Ya mere, ndị enyi m hụrụ nʼanya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ.

15Ana m agwa ndị nwere uche okwu, unu onwe unu tulenụ ihe m na-ekwu.

16Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst?

1 Ndị Kọrint 10

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 Corinthians 10:13No temptation has seized you except what is common to man. And God is faithful; He will not let you be tempted beyond what you can bear. But when you are tempted, He will also provide an escape, so that you can stand up under it.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

2Pt 2:9Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ.
2Tm 4:18Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
2Te 3:3Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ.
1Pt 5:8–9Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi. Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.
Hib 12:4Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu.
1Te 5:24Onye ahụ kpọrọ unu ga-emezu ihe ndị a, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.
2Kọ 12:8–10Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọ Onyenwe anyị ka o wepụrụ m ahụ mgbu a. Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m. Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.
Efe 6:12–13Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe. Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike