Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Filipai 4:8

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Filipai 4:8

Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Filipai 4

N’ọnọdụ ya

5Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.

6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.

7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.

8Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya.

9Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.

10Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya.

11Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla.

Ndị Filipai 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BiblePhilippians 4:8Finally, brothers, whatever is true, whatever is honorable, whatever is right, whatever is pure, whatever is lovely, whatever is admirable—if anything is excellent or praiseworthy—think on these things.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jem 3:17Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya.
Taị 2:7Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi.
2Kọ 8:21Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị naanị nʼihu Onyenwe anyị, kama nʼihu ndị mmadụ kwa.
Gal 5:22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi,
1Te 5:21–22Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike. Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile.
2Pt 1:3–7O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya. O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute. Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma, tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi. Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna.
Efe 5:9(nʼihi na a na-ahụ mkpụrụ nke ìhè nʼihe niile dị mma, na ihe ziri ezi, na eziokwu).
Hib 13:18Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike