Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Ndị Kọrint 6:14

Amaokwu Baịbụl · IGCB

2 Ndị Kọrint 6:14

Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?

Gụọ isi ahụ dum: 2 Ndị Kọrint 6

N’ọnọdụ ya

11Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe niile dị anyị nʼobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu.

12Anyị ji obi anyị niile hụ unu nʼanya, ma unu mechiri obi unu nʼebe anyị nọ.

13Ugbu a, ana m ekwu dịka ana m agwa ụmụntakịrị. Na-emesonu anyị dịka anyị si emeso unu, meenụ ka obi unu saa mbara nʼebe anyị nọ.

14Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?

15Ọ bụ nwekọ dị aṅaa dị na-agbata Kraịst na ekwensu? Gịnịkwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ?

16Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru, “M ga-ebi nʼime ha. Jegharịakwa nʼime ha. M ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”

17Ya mere, “Sinụ nʼetiti ha pụta. Nọpụkwanụ iche nʼebe ha nọ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka. Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.”

2 Ndị Kọrint 6

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible2 Corinthians 6:14Do not be unequally yoked with unbelievers. For what partnership can righteousness have with wickedness? Or what fellowship does light have with darkness?

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Kọ 15:33Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa.
1Kọ 10:21Unu apụghị ịṅụ site nʼiko Onyenwe anyị ma ṅụọkwa site nʼiko ekwensu; unu apụghịkwa inwe oke site na tebul Onyenwe anyị na tebul ekwensu.
Jem 4:4Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.
Lev 19:19“ ‘Unu ga-edebe iwu m niile. “ ‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “ ‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “ ‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.
1Pt 2:9–10Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube. Nʼoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mbụ, unu amaghị ihe ọbụla banyere obi ebere ya, ma ugbu a, obi ebere ya erutela unu aka.
Abụ 26:4–5Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ. Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.
Dit 22:9–11Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi vaịnị gị. Ọ bụrụ na i mee otu a, ihe ọkụkụ ndị a, na mkpụrụ ha mịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ. Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi. Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ kpaa, dịka uwe ajị anụ na ogho ọcha kpaa.
Abụ 139:21–22O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị, na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi? Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ? Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike