Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 3:23

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Rom 3:23

Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Rom 3

N’ọnọdụ ya

20Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie.

21Ma ugbu a, emeela ka ezi omume Chineke pụta ìhè, site nʼiguzo iche nʼebe iwu dị, bụ nke iwu na ndị amụma gbakwara ama ya.

22Ezi omume a na-esite nʼebe Chineke nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya.

23Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke.

24Ma ugbu a, agụọla ha na ndị ezi omume site nʼamara ya, site na mgbapụta nke si nʼaka Kraịst Jisọs.

25Onye Chineke họpụtara ka o were ndụ ya chụọ aja ikpuchi mmehie, site nʼiwufu ọbara ya maka mgbaghara mmehie, nke a ga-anata site nʼokwukwe. Nʼụzọ dị otu a, ọ na-egosipụta ezi omume ya, maka oge gara aga, nʼihi nnagide ya, o jiri ndidi leghara mmehie ụmụ mmadụ anya.

26Ma nʼoge taa, site nʼigosi na ya onwe ya bụ onye ezi omume, na onye a na-agụnye dịka onye ezi omume bụ onye nke kweere na Jisọs.

Ndị Rom 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleRomans 3:23for all have sinned and fall short of the glory of God,

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ekl 7:20Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.
1Jọn 1:8–10Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị, na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ nʼime anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile. Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọbụla, anyị na-akpọ ya onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nʼime anyị.
Rom 3:9Gịnị kwanụ? Anyị ọ ka ha mma? Mba, ma e meela ya rịị ka ọ pụta ìhè na mmadụ niile nọ nʼokpuru mmehie, ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ.
Gal 3:22Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst.
Rom 11:32Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya.
Rom 3:19Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe Chineke nọ.
1Te 2:12na-agba unu ume, na-akasị unu obi, na-akwagidekwa unu na unu kwesiri ibi ndụ kwesiri ụmụ Chineke, onye kpọbatara unu nʼime alaeze ya na ebube ya.
2Te 2:14Nʼihi nke a, ọ kpọrọ unu site nʼoziọma anyị ka unu nweta otuto nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike