Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 13:8
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Rom 13:8
Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ.
N’ọnọdụ ya
5Ya mere unu kwesiri irubere ndị na-achị achị isi, ọ bụghị naanị maka ahụhụ dịrị ndị nnupu isi, kama nʼihi akọnuche.
6Ọ bụkwa nke a kpatara unu ji na-atụ ụtụ isi nke taks, nʼihi na ndị na-achị achị na-ejere Chineke ozi mgbe ha na-aga nʼihu nʼezi ọchịchị.
7Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu.
8Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ.
9Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,” nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.”
10Ịhụnanya adịghị echere onye agbataobi ya echiche ọjọọ, ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu niile.
11Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya abịala nso. Ya mere, sitenụ nʼụra bilie, nʼihi na nzọpụta anyị adịla nso ugbu a karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ.
N’asụsụ Bekee
Be indebted to no one, except to one another in love. For he who loves his neighbor has fulfilled the law.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’ Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.”Nʼihi na ọ bụrụ na a chịkọta iwu niile nʼotu, ihe iwu niile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nʼanya dịka unu si hụ onwe unu nʼanya.”Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri.Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya. A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa.“Ana m enye unu iwu ọhụrụ: Hụrịtanụ onwe unu nʼanya. Dị ka m hụrụ unu nʼanya, otu a ka unu ga-esi hụrịta onwe unu nʼanya.Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike