Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 5:44

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 5:44

Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 5

N’ọnọdụ ya

41Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii.

42Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka i binye ha ego.

43“Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya, ma kpọkwanụ ndị iro unu asị.’

44Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.

45Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.

46Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a.

47Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ.

Matiu 5

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 5:44But I tell you, love your enemies and pray for those who persecute you,

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Rom 12:14Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ.
1Pt 3:9Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.
Luk 6:27–28“Ma a na m agwa unu ndị na-ege m ntị: hụnụ ndị iro unu nʼanya, mekwaaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma. Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpekwaaranụ ndị na-akparị unu ekpere.
Rom 12:20–21Ma otu ọ dị, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ, mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.” Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.
Ilu 25:21–22Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ. Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.
Luk 23:34Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha.
1Pt 2:23O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ọrụ 7:60O gburu ikpere nʼala werekwa oke olu tie mkpu, “Onyenwe anyị, biko agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusiri nke a, ọ dara nʼala nwụọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike