Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Timoti 2:22

Amaokwu Baịbụl · IGCB

2 Timoti 2:22

Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta.

Gụọ isi ahụ dum: 2 Timoti 2

N’ọnọdụ ya

19Ma ntọala Chineke hiwere na-eguzosi ike. Nʼelu ya ka eji ihe e dere kaa akara: “Onyenwe anyị maara ndị bụ ndị nke ya,” ya na, “Ka onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraịst kwụsị ibi ndụ ajọ omume.”

20Nʼime ụlọ ukwuu, ọtụtụ ngwa ọrụ dị ya, ndị e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, maọbụ osisi maọbụ ụrọ kpụọ. Ụfọdụ ka e ji eje ozi nʼoge nkwanye ugwu dị mkpa, ndị ọzọ ka e ji eje ozi nʼoge ọbụla.

21Ọ bụrụ na onye ọbụla edoo onwe ya ọcha pụọ nʼihe ọjọọ niile, ọ ga-abụ ngwa ọrụ e mere maka ọrụ ndị kwesiri nkwanye ugwu, bụrụkwa onye dị nsọ, onye na-abara Onyenwe ya uru, na onye dị njikere mgbe ọbụla ịrụ ezi ọrụ.

22Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta.

23Wezuga onwe gị nʼịrụ ụka nzuzu na nke amaghị ihe niile, nʼihi na ị maara na ha na-eweta ise okwu.

24O kwesikwaghị ka ohu Onyenwe anyị bụrụ onye na-ese okwu, kama, ọ ga-abụ onye obiọma nye mmadụ niile, na onye ma otu e si ezi ihe, onye dị njikere ịnagide ihe ọjọọ e mere ya.

25Ọ ga-ejiri obi dị nwayọ mgbe ọ na-adụ ndị iro ya ọdụ. Eleghị anya Chineke nwere ike mee ka ha chegharịa, bịa mata eziokwu.

2 Timoti 2

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible2 Timothy 2:22Flee from youthful passions and pursue righteousness, faith, love, and peace, together with those who call on the Lord out of a pure heart.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 2:11Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha.
1Pt 3:11Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe; ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya.
1Kọ 6:18Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.
1Tm 6:11Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ.
Abụ 119:9Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.
Hib 12:14Gbalịsie ike mee ka gị na mmadụ niile biri nʼudo ya na ndụ dị nsọ, e wepụ ya, o nweghị onye pụrụ ịhụ Onyenwe anyị.
1Tm 4:12Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche.
Abụ 66:18–19Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị; ma Chineke gere ntị nʼezie, nụrụkwa olu arịrịọ m.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike