Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 18:6

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 18:6

“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 18

N’ọnọdụ ya

3ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe.

4Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe.

5Onye ọbụla nabatara nwantakịrị dị otu a nʼihi m, bụ onye nabatara m.

6“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya.

7Ahụhụ ga-adịrị ụwa nʼihi ihe ndị na-eme ka mmadụ jehie. Ihe ndị na-eme ka mmadụ daba nʼọnwụnwa aghaghị ịbịa, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ọ ga-esite nʼaka ya bịa.

8Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi.

9Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ.

Matiu 18

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 18:6But if anyone causes one of these little ones who believe in Me to stumble, it would be better for him to have a large millstone hung around his neck and to be drowned in the depths of the sea.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Mak 9:42“Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri.
Luk 17:1–2Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa. Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ.
Mat 18:10“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile.
2Te 1:6–9Chineke bụ onye ezi omume nʼezie. Ọ ga-eji mkpagbu kwụghachi ndị na-akpagbu unu. Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè. Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya,
Mat 18:14Ya mere, ọ bụghị nzube Nna m nke bi nʼeluigwe ka otu nʼime ụmụnta ndị a ala nʼiyi.
Rom 15:1–3Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ. Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu. Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!”
Abụ 105:15sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka; unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
1Kọ 8:9–13Ma lezienụ anya, otu o si dị, ka ike unu nwere ime ihe ọbụla dị unu mma, ghara ịghọ ihe ịsọ ngọngọ dịrị ndị na-adịghị ike nʼokwukwe ha. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị ọzọ ahụ gị, gị onye nwere akọnuche, ka ị nọ, na-eri nri nʼụlọ arụsị, ọ bụ na ha agaghị eche na ha bụ ndị okwukwe ha na-esighị ike, ga-enwe obi ike soro gị rie nri a gọrọ arụsị? Nʼụzọ dị otu a, ndị kwere ekwe na-adịghị ike, ndị Kraịst nwụrụ nʼihi ha, na-esite nʼihe mmụta gị laa nʼiyi. Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, mgbe unu na-emegide mmụọ nwanne gị nʼime Kraịst, nʼihi nʼakọnuche ha esighị ike. Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m mee mmehie, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m maa nʼọnya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike