Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 5:8
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Rom 5:8
Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.
N’ọnọdụ ya
5Olileanya na-eme ka anyị guzo chịm, nʼihi na Chineke awụnyela ịhụnanya ya nʼime obi anyị site nʼonyinye Mmụọ Nsọ.
6Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọbụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Kraịst bịara nwụọ ọnwụ nʼihi anyị bụ ndị mmehie.
7A sịkwarị na anyị bụ ndị ezi omume ọ gaara abụ ihe siri ike mmadụ ịbịa nwụọ ọnwụ nʼihi anyị. Ma eleghị anya, a ga-ahụkwa onye nwere ike nwụọ nʼihi ezi mmadụ.
8Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.
9Ebe a gụrụ anyị dịka ndị ezi omume site nʼọbara ya, nke karịrị nke a, a ga-esitekwa na ya zọpụta anyị site nʼọnụma Chineke.
10Nʼihi na, ọ bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro Chineke, e mere ka anyị na ya dị nʼudo site nʼọnwụ Ọkpara ya, nke karịrị nke a bụ, ebe ọ bụ na anyị na ya dịzi na mma, anyị ga-enweta nzọpụta site na ndụ ya.
11Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime Chineke site na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye anyị sitere na ya nata ịdị na mma a ugbu a.
N’asụsụ Bekee
But God proves His love for us in this: While we were still sinners, Christ died for us.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya.Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya.E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.Ọ bụ otu a ka anyị sị mata ihe bụ ịhụnanya, na Jisọs tọgbọrọ ndụ ya nʼihi anyị. Anyị kwesikwara ịtọgbọ ndụ anyị nʼihi ụmụnna anyị.Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ; onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya. Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya ajọ omume anyị niile.O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike