Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ilu 16:3

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ilu 16:3

Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.

Gụọ isi ahụ dum: Ilu 16

N’ọnọdụ ya

1Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime, ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.

2Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.

3Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.

4Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya, o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.

5Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.

6Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.

Ilu 16

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleProverbs 16:3Commit your works to the LORD and your plans will be achieved.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Abụ 37:4–5Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
Ilu 3:6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
Abụ 55:22Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, ọ ga-agba gị ume; ọ gaghị ekwe ka ewezuga onye ezi omume.
Fil 4:6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.
1Pt 5:7Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
Job 22:28Ihe i kpebiri ga-emezukwa, ìhè ga-amụkwasị nʼụzọ gị niile.
Job 5:8“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile.
Luk 12:22Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ya mere, asị m unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike