Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 5:22

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 5:22

Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘ Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 5

N’ọnọdụ ya

19Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.

20Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị.

21“Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’

22Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘ Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ.

23“Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nʼebe ịchụ aja, ma cheta nʼebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nʼudo,

24hapụ onyinye gị nʼebe ịchụ aja, laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu mere udo, laghachi bịa nye onyinye gị.

25“Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.

Matiu 5

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 5:22But I tell you that anyone who is angry with his brother will be subject to judgment. Again, anyone who says to his brother, ‘Raca,’ will be subject to the Sanhedrin. But anyone who says, ‘You fool!’ will be subject to the fire of hell.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Jọn 3:14–15Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ. Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya.
1Jọn 4:20–21Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya. Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ Chineke nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.”
1Jọn 2:9Onye ọbụla na-asị na ya nọ nʼìhè ma na-akpọ nwanna ya asị, na-anọ nʼọchịchịrị ruo ugbu a.
Efe 4:26–27Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe. Enyela ekwensu ohere.
Efe 4:31–32Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu. Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.
Jem 3:6Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ.
Taị 3:2Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọbụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama, ka ha bụrụ enyi mmadụ niile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nʼebe mmadụ niile nọ.
Mat 10:28Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike