Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ọrụ Ndị Ozi 20:28
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ọrụ Ndị Ozi 20:28
Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya.
Gụọ isi ahụ dum: Ọrụ Ndị Ozi 20
N’ọnọdụ ya
25“Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ.
26Ya mere, ana m agwasị unu ike, taa, na abụ m onye aka ya dị ọcha nʼebe ọbara onye ọbụla nʼime unu dị.
27Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.
28Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya.
29Nʼihi na amaara m na mgbe m lachara, agụ jọgburu onwe ya ga-abata nʼetiti unu nke na-agaghị emere igwe atụrụ ebere.
30Ụfọdụ nʼime unu ga-ebili tụgharịa eziokwu ahụ ịhụ ka ha si otu a dọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ nye onwe ha.
31Ya mere, na-echenụ nche! Chetakwanụ na nʼime afọ atọ m nọrọ nʼetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri na-adụ unu ọdụ.
N’asụsụ Bekee
Keep watch over yourselves and the entire flock of which the Holy Spirit has made you overseers. Be shepherds of the church of God, which He purchased with His own blood.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi. Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ.Na-elezi anya na ndụ gị, na ozizi gị. Nọgidesie ike nʼihe ndị a nʼihi na site na ha, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.Nʼihi na unu matara na-ejighị ihe pụrụ imebi emebi, dịka ọlaọcha na ọlaedo gbapụta unu site nʼibi ndụ ọjọọ ahụ nna nna unu ha nyefere unu nʼaka kama ọ bụ ọbara dị oke ọnụahịa nke Kraịst bụ nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ọrụsị.Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.Ya mere onye ụkọchukwu kwesiri ịbụ onye a na-adịghị ata ụta, onye lụrụ otu nwunye, onye obi umeala, onye na-achịkọta onwe ya nke ọma, onye nwere nsọpụrụ, onye na-anabata ndị ọbịa nʼụlọ ya, nakwa onye nwere ike ikuzi ihe.Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.”Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu.Unu emejọla ndị Juu maọbụ ndị Griik, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike