Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 15:13
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jọn 15:13
Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya.
N’ọnọdụ ya
10Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya.
11Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke.
12Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya.
13Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya.
14Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu.
15Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m.
16Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m.
N’asụsụ Bekee
Greater love has no one than this, that he lay down his life for his friends.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya.Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ.Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọbụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Kraịst bịara nwụọ ọnwụ nʼihi anyị bụ ndị mmehie. A sịkwarị na anyị bụ ndị ezi omume ọ gaara abụ ihe siri ike mmadụ ịbịa nwụọ ọnwụ nʼihi anyị. Ma eleghị anya, a ga-ahụkwa onye nwere ike nwụọ nʼihi ezi mmadụ. Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ.Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, ọ makwara Chineke. Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya. E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị. Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike