Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ekiliziastis 4:9–12

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ekiliziastis 4:9–12

9Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:

10Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.

11Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?

12Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.

Gụọ isi ahụ dum: Ekiliziastis 4

N’ọnọdụ ya

6Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo, karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ, nke bụ naanị ịchụso ifufe.

7Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu.

8Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ, o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne. Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ, ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere. Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,” “nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?” Ihe nke a enweghị isi, ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ.

9Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:

10Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.

11Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?

12Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.

13Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla.

14Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ.

15Ahụrụ m na mmadụ niile ndị bi nʼokpuru anyanwụ na-eso nwantakịrị ahụ onye nọchiri anya eze.

Ekiliziastis 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleEcclesiastes 4:9–12Two are better than one, because they have a good return for their labor. For if one falls down, his companion can lift him up; but pity the one who falls without another to help him up! Again, if two lie down together, they will keep warm; but how can one keep warm alone? And though one may be overpowered, two can resist. Moreover, a cord of three strands is not quickly broken.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 27:17Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
Jen 2:18Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.”
1Kọ 12:18–21Ma otu ihe si dị, Chineke debere nʼotu nʼotu akụkụ niile dị nʼahụ dịka o si chọọ. A sị na akụkụ niile dị nʼahụ bụ otu ihe, kedụ ebe ahụ ga-adị? Otu ọ dị, ọ bụ ezie na ihe dị nʼahụ dị ọtụtụ, ma ha niile bụ otu ahụ. Nʼihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka sị, “Achọghị m gị, nʼihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ sị, “Achọghị m inyeaka gị.”
Mak 6:7Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha.
Ọnụ 11:14Agaghị m ebulite ibu ịchịkọta ndị a niile nʼonwe m! Ibu a dị m arọ nke ukwuu.
1Te 5:11Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.
Jọn 4:36Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ.
Rut 2:12Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.”

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike