Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jenesis 1:29

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jenesis 1:29

Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị.

Gụọ isi ahụ dum: Jenesis 1

N’ọnọdụ ya

26Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.”

27Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha.

28Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.”

29Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị.

30Ma ụmụ anụmanụ niile na anụ ufe niile, na anụ niile e kere eke na-akpụgharị akpụgharị nʼala, anụ ọbụla nwere ndụ nʼime ha ka m na-enye ahịhịa ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.”

31Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na ọ dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke isii.

Jenesis 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleGenesis 1:29Then God said, “Behold, I have given you every seed-bearing plant on the face of all the earth, and every tree whose fruit contains seed. They will be yours for food.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jen 9:3Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile.
Abụ 104:14–15Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya, ime ka nri site nʼala pupụta; mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị, mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma, na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.
Abụ 145:15–16Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru. I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.
Abụ 104:27–28Ha niile na-adabere na gị, ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru. Ị na-enye ha nri; ha na-erikwa ya. Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, afọ na-eju ha nke ọma.
Ọrụ 14:17Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.”
Abụ 147:9Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike