Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 15:13
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Rom 15:13
Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.
N’ọnọdụ ya
10O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.”
11Ọzọkwa, “Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.”
12Ọzọkwa, Aịzaya na-asị, “Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ, onye nke ga-ebili ịchị mba niile, ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.”
13Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.
14Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe.
15Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m,
16abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ.
N’asụsụ Bekee
Now may the God of hope fill you with all joy and peace as you believe in Him, so that you may overflow with hope by the power of the Holy Spirit.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya, gbaa obi unu ume, ma mee ka unu guzosie ike nʼịrụ ọrụ na ikwukwa ihe niile dị mma.Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma.Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi,Nʼihi na alaeze Chineke abụghị oriri na ọṅụṅụ kama ọ bụ ezi omume, na udo na ọṅụ nʼime Mmụọ Nsọ.“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m.Ka Chineke ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka Kraịst Jisọs nwere.Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike