Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Galeshịa 6:9
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Galeshịa 6:9
Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
Gụọ isi ahụ dum: Ndị Galeshịa 6
N’ọnọdụ ya
6Ka onye a na-akụziri okwu ahụ jisie ike ka ya na onye nkuzi ya na-ekekọ ezi ihe niile.
7Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.
8Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi.
9Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
10Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.
11Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo.
12Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst.
N’asụsụ Bekee
Let us not grow weary in well-doing, for in due time we will reap a harvest if we do not give up.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu.Otu ọ dị ụmụnna, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu.Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa. Nʼihi, “Na oge na-adịghị anya, onye ahụ nke na-abịa ga-abịa ọ gaghị anọkwa ọdụ.” Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.” Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba.Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu.Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya.Nʼihi na ọ ka mma ịta ahụhụ nʼihi ezi ihe ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụhụ nʼihi ajọ ihe.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike