Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jenesis 1:26

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jenesis 1:26

Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.”

Gụọ isi ahụ dum: Jenesis 1

N’ọnọdụ ya

23Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke ise.

24Chineke kwuru sị, “Ka ala wepụta ụmụ anụ dị iche iche nwere ndụ dịka ụdịdị ha si dị: anụ ụlọ, anụ na-akpụgharị nʼala, na anụ ọhịa, nke ọbụla dịka ụdịdị ya si dị.” O si otu a dịrị.

25Chineke mere ụmụ anụ ọhịa, dịka ụdịdị ha si dị, mee anụ ụlọ, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ niile nwere ndụ nke na-akpụgharị nʼala dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.

26Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.”

27Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha.

28Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.”

29Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị.

Jenesis 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleGenesis 1:26Then God said, “Let Us make man in Our image, after Our likeness, to rule over the fish of the sea and the birds of the air, over the livestock, and over all the earth itself and every creature that crawls upon it.”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Kọl 3:10Ugbu a, unu eyikwasịla ndụ ọhụrụ ahụ, nke e ji amamihe na-eme ka ọ dị ọhụrụ nʼoyiyi nke onye kere ya.
Efe 4:24Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.
Abụ 8:4–8gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha? I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile, na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.
Jen 3:22Onyenwe anyị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Jen 5:1Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.
Abụ 100:3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.
2Kọ 3:18Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.
Jen 9:2–4Egwu unu na ụjọ unu ga-adakwasị anụmanụ niile nke ụwa nke dị ndụ, na anụ ufe niile nke eluigwe, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, na azụ niile dị nʼosimiri. Ewerela m ha niile nyefee unu nʼaka. Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile. “Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike