Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Jọn 4:18

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Jọn 4:18

Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Jọn 4

N’ọnọdụ ya

15Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke.

16Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.

17Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a.

18Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.

19Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya.

20Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya.

21Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ Chineke nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.”

1 Jọn 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 John 4:18There is no fear in love, but perfect love drives out fear, because fear involves punishment. The one who fears has not been perfected in love.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

2Tm 1:7Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
Rom 8:15Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba, Nna.”
1Jọn 4:12O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị.
Luk 1:74–75Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu. Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.
Hib 12:28Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata.
Jem 2:19I kweere na ọ bụ naanị otu Chineke, i mere nke ọma, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere ma kụja.
Abụ 119:120Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike