Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Galeshịa 6:7

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Galeshịa 6:7

Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Galeshịa 6

N’ọnọdụ ya

4Ka onye ọbụla nyocha ọrụ ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ya dị mma, mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịnya isi nʼime onwe ya na-abụghị nʼebe ọrụ onye ọzọ dị.

5Nʼihi na onye ọbụla ga-ebu ibu nke dịịrị ya.

6Ka onye a na-akụziri okwu ahụ jisie ike ka ya na onye nkuzi ya na-ekekọ ezi ihe niile.

7Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ.

8Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi.

9Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.

10Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.

Ndị Galeshịa 6

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleGalatians 6:7Do not be deceived: God is not to be mocked. Whatever a man sows, he will reap in return.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

2Kọ 9:6Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne.
Hos 10:12Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu, unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya. Kọgharịakwanụ obi unu siri ike, nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ bịara wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume.
Job 4:8Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka na-aghọta ya dịka ihe ubi.
Rom 2:6–10Ọ ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị. Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi. Ma ndị niile na-akpa iche iche, ndị jụkwara isoro eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka a ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma. Nsogbu na iru ụjụ ga-abịakwasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ, mbụ, ọ ga-adịrị ndị Juu, emechaa, ọ ga-adịkwara ndị mba ọzọ. Ma otuto na nsọpụrụ na udo ga-abụ nke onye ọbụla na-eme ezi ihe, malite nʼonye Juu ruokwa na ndị mba ọzọ.
1Kọ 15:33Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa.
Ilu 11:18Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ, ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.
Ilu 1:31Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta. Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ.
Efe 5:6Unu ekwela ka onye ọbụla jiri okwu efu duhie unu. Ọ bụ nʼihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị na-anaghị erubere ya isi.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike