Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Diuteronomi 31:6
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Diuteronomi 31:6
Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu.”
Gụọ isi ahụ dum: Diuteronomi 31
N’ọnọdụ ya
3Onyenwe anyị Chineke gị nʼonwe ya ga-ebu gị ụzọ gabiga osimiri a. Ọ ga-ebibi mba niile ndị a nʼihu gị. Ị ga-enwetakwa ala ha. Joshua ga-edu gị gabiga osimiri a, dịka Onyenwe anyị kwuru.
4Onyenwe anyị ga-emekwa ha ihe o mere Saịhọn na Ọg, bụ eze ndị Amọrait, ndị o kpochapụrụ ha na ala ha.
5Onyenwe anyị ga-enyefe ndị bi nʼebe ahụ nʼaka unu, unu ga-ekpochapụkwa ha dịka m nyere unu nʼiwu.
6Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu.”
7Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Joshua, gwa ya okwu nʼihu ụmụ Izrel, sị ya, “Dị ike! Nwee obi ike! Nʼihi na ọ bụ gị ga-edu ndị a baa nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi inye nna nna ha, ị ga-emekwa ka ha keta ala a dịka ihe nketa ha.
8Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba.”
9Mgbe ahụ, Mosis depụtara iwu ndị ahụ niile nʼakwụkwọ, were ya nye ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Mosis nyekwara ndị okenye Izrel akwụkwọ a e dere iwu niile.
N’asụsụ Bekee
Be strong and courageous; do not be afraid or terrified of them, for it is the LORD your God who goes with you; He will never leave you nor forsake you.”E hotara ya n’Agba Ọhụrụ
Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.”Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu.Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, “Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị gwụsịrị.Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.“Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ.Ya mere, nwa m, bụrụ onye dị ike site nʼamara ahụ Kraịst Jisọs na-enye.Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike