Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ilu 20:1
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ilu 20:1
Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.
N’ọnọdụ ya
1Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.
2Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm; ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha.
3Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka, ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.
4Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.
N’asụsụ Bekee
Wine is a mocker, strong drink is a brawler, and whoever is led astray by them is not wise.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ,nʼaka ịgba akwụna, na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, nke na-ewepụ mmụọ nghọta.Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya. Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya, mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme; ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche, ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe.ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke.Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya, nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, ka o si otu a hụ ọtọ ya anya. Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike