Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Kọrint 7:2

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Ndị Kọrint 7:2

Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Kọrint 7

N’ọnọdụ ya

1Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: “Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka.”

2Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.

3Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.

4Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya.

5Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.

1 Ndị Kọrint 7

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 Corinthians 7:2But because there is so much sexual immorality, each man should have his own wife, and each woman her own husband.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Efe 5:28Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya.
Efe 5:33Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.
1Kọ 7:9Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.
Ilu 18:22Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
Ilu 5:18–19Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị; ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị. Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma, ka ara dị ya nʼobi zuore gị, ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.
1Kọ 6:18Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike