Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 10:9

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Rom 10:9

Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Rom 10

N’ọnọdụ ya

6Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ” (nke bụ, ikudata Kraịst)

7“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ).

8Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa.

9Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.

10Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị.

11Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”

12Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke.

Ndị Rom 10

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleRomans 10:9that if you confess with your mouth, “Jesus is Lord,” and believe in your heart that God raised Him from the dead, you will be saved.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Luk 12:8“Ma asị m unu, na onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, onye ahụ ka Nwa nke Mmadụ ga-ekwupụta nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke.
Ọrụ 16:31Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.”
Fil 2:11Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
Mat 10:32–33“Ya mere, onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, ka mụ onwe m ga-ekwupụta nʼihu Nna m bi nʼeluigwe. Ma onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nʼihu Nna m bi nʼeluigwe.
1Jọn 4:2–3Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke. Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa.
1Pt 1:21Ọ bụkwa site nʼaka ya ka unu ji bụrụ ndị kwere na Chineke, onye mere ka o si nʼọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, okwukwe unu na olileanya unu dị na Chineke.
Rom 8:34Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ.
1Kọ 15:14–18Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere bụkwa ihe efu. Ma karịa nke a, a na-ahụta anyị ka ndị ama ụgha nke Chineke, nʼihi na anyị gbara ama banyere Chineke, na-asị na o mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, bụ onye ọ na-emeghị ka o si nʼọnwụ bilie ma ọ bụrụ na-emeghị ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ. Nʼihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, emekwaghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie. Ma ọ bụrụ na-emeghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, okwukwe unu bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu. Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ nʼime Kraịst lara nʼiyi.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike