Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Kọrint 13:4–7
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Ndị Kọrint 13:4–7
4Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.
5Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya.
6Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu.
7Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara.
Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Kọrint 13
N’ọnọdụ ya
1A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda.
2A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla.
3A sịkwa na m ewere ihe niile m nwere nye ndị ogbenye, werekwa anụ ahụ m nye ka ere ya ọkụ nʼihi ka m nyaa isi, ihe ndị a niile abaghị uru, ma m enweghị ịhụnanya.
4Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.
5Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya.
6Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu.
7Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara.
8Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma niile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma niile ga-agabiga.
9Nʼihi na ọmụma anyị ezughị oke, ibu amụma anyị ezukwaghị oke.
10Ma mgbe anyị ruru nʼizuoke, ezughị oke agaghị adịkwa.
N’asụsụ Bekee
Love is patient, love is kind. It does not envy, it does not boast, it is not proud. It is not rude, it is not self-seeking, it is not easily angered, it keeps no account of wrongs. Love takes no pleasure in evil, but rejoices in the truth. It bears all things, believes all things, hopes all things, endures all things.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nke ukwuu nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke. Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi,Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi.Ka ịhụnanya bụrụ nke ihu abụọ nʼadịghị na ya, kpọọ ihe ọjọọ asị, jidesie ihe dị mma ike.Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu.Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike