Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Galeshịa 3:28
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Galeshịa 3:28
E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs.
Gụọ isi ahụ dum: Ndị Galeshịa 3
N’ọnọdụ ya
25Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ.
26Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs.
27Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst.
28E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs.
29Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.
N’asụsụ Bekee
There is neither Jew nor Greek, slave nor free, male nor female, for you are all one in Christ Jesus.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Dịka ahụ anyị si nwe akụkụ dị iche iche, ma bụrụkwa otu ahụ, nʼagbanyeghị na o nwere ọtụtụ akụkụ, otu a ka anụ ahụ Kraịst dịkwa. Site nʼotu Mmụọ Nsọ ahụ ka e mere anyị niile baptizim nʼotu nʼotu, ma ndị Juu ma ndị Griik, ma ohu ma ndị nwe onwe ha. E meela ka anyị ṅụọ ọbara ya, nʼime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ.Nkewa ọbụla adịghị nʼime ndụ a. Ọ dịghị mkpa maọbụ onye Juu maọbụ onye mba ọzọ, maọbụ onye e biri ugwu, maọbụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa maọbụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bu onye ime ọhịa, maọbụ onye Sitia, maọbụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ na Kraịst bụ ihe niile, nọrọkwa nʼime ihe niile.Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ. Nʼihi na Chineke dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume.Nʼihi nʼime Kraịst Jisọs, obibi ugwu maọbụ ebighị ugwu abaghị uru. Ihe dị mkpa bụ okwukwe nke na-egosi onwe ya site nʼịhụnanya.Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke. Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.” Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị? Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu.Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ?Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike