Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jenesis 2:24
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jenesis 2:24
Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
N’ọnọdụ ya
21Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya.
22Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ.
23Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.”
24Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
25Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ihere emeghị ha.
N’asụsụ Bekee
For this reason a man will leave his father and mother and be united to his wife, and they will become one flesh.E hotara ya n’Agba Ọhụrụ
Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ.‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’ Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ.Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”“Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya. Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị. Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya. “Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye.Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya. Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ. Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya.Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ.Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya? Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị. Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ. “Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya. A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike