Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Kọrint 6:19–20
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Ndị Kọrint 6:19–20
19Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.
20E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.
Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Kọrint 6
N’ọnọdụ ya
16Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”
17Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ.
18Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.
19Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.
20E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.
N’asụsụ Bekee
Do you not know that your body is a temple of the Holy Spirit who is in you, whom you have received from God? You are not your own; you were bought at a price. Therefore glorify God with your body.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu?Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru, “M ga-ebi nʼime ha. Jegharịakwa nʼime ha. M ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst.Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị. Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.Akwụọla ụgwọ isi unu, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ.Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa! Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike