Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Kọrint 9:24–27
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Ndị Kọrint 9:24–27
24Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ.
25Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi.
26Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe.
27Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka ọ bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara ị bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.
Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Kọrint 9
N’ọnọdụ ya
21Nʼebe ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nọ, emere m onwe m ka onye na-anọghị nʼokpuru iwu (ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe iwu Chineke na-achọ. Ana m emekwa dịka onye nọ nʼokpuru iwu Kraịst), ka m nwee ike rite ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nʼuru.
22Nʼebe ndị na-adịghị ike nọ, ana m emekwa dịka ha, ka m nwee ike rite ndị na-adịghị ike nʼuru. Otu ọbụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike site nʼụzọ niile ọbụla zọpụta ụfọdụ.
23Ana m eme ihe ndị a niile nʼihi oziọma, ma ka m nwekwa ike keta oke na ngọzị ya.
24Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ.
25Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi.
26Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe.
27Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka ọ bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara ị bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.
N’asụsụ Bekee
Do you not know that in a race all the runners run, but only one receives the prize? Run in such a way as to take the prize. Everyone who competes in the games trains with strict discipline. They do it for a crown that is perishable, but we do it for a crown that is imperishable. Therefore I do not run aimlessly; I do not fight like I am beating the air. No, I discipline my body and make it my slave, so that after I have preached to others, I myself will not be disqualified.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu.Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ.Alụsịala m ọgụ ọma ahụ, agbasịala m ọsọ ahụ, edebezuokwala m okwukwe ahụ. Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya.Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).Ana m abịa ọsịịsọ. Jidesienụ ihe unu nwere aka ike, ka onye ọbụla ghara ịnapụ gị okpueze gị.Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu.Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu nyochaa onwe ya, tulekwa omume ya, mara ma ọ ka kwudosiri ike nʼokwukwe ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na Jisọs Kraịst nọ nʼime unu? Ma ọ bụghị na unu enyochaala onwe unu hụ na unu emeghị nke ọma. Enwere m olileanya na unu niile ga-achọpụta na anyị adaghị ule ahụ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike