Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Kọrint 3:16–17

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Ndị Kọrint 3:16–17

16Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu?

17Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Kọrint 3

N’ọnọdụ ya

13ọrụ onye ọbụla ga-egosipụta ihe ọ bụ, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè. A ga-eji ọkụ kpughee ya nʼihi na ọ bụ ọkụ ka a ga-eji nwapụta ụdị ọrụ ọ bụ mmadụ ọbụla rụrụ.

14Ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọbụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nʼelu ntọala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ.

15Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọbụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nʼiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma ọ ga-adị ka a ga-asị na e si nʼụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya.

16Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu?

17Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.

18Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe.

19Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.”

20Ọzọkwa, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.”

1 Ndị Kọrint 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 Corinthians 3:16–17Do you not know that you yourselves are God’s temple, and that God’s Spirit dwells in you? If anyone destroys God’s temple, God will destroy him; for God’s temple is holy, and you are that temple.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Kọ 6:19Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.
Izk 36:27Aga m etinyekwa mmụọ m nʼime unu, mee ka unu gbaso ụkpụrụ m niile ma lezie anya mekwaa ihe niile m nyere nʼiwu.
2Kọ 6:16Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru, “M ga-ebi nʼime ha. Jegharịakwa nʼime ha. M ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”
Rom 8:11Ọ bụrụ na Mmụọ onye mere ka Jisọs si nʼọnwụ bilie, bi nʼime gị, onye ahụ nke mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ site nʼike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nʼime gị.
Efe 2:21–22Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị. Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.
Rom 8:9Ma lee! Unu onwe unu anaghị ebizi ndụ nʼusoro nke anụ ahụ, kama unu na-ebi nʼusoro nke Mmụọ Nsọ nʼihi na Mmụọ nke Chineke bi nʼime unu. Onye ọbụla na-enweghị Mmụọ nke Kraịst abụghị nke ya.
Jọn 14:17Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu.
1Pt 2:5Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike