Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Kọrint 6:18

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Ndị Kọrint 6:18

Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Kọrint 6

N’ọnọdụ ya

15Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa!

16Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”

17Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ.

18Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.

19Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.

20E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

1 Ndị Kọrint 6

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 Corinthians 6:18Flee from sexual immorality. Every other sin a man can commit is outside his body, but he who sins sexually sins against his own body.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 2:11Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha.
1Te 4:3Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko,
Kọl 3:5Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).
Rom 6:12–13Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi. Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.
2Tm 2:22Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta.
Hib 13:4Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.
1Kọ 6:9Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,
Efe 5:3Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike