Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Ndị Kọrint 10:31
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Ndị Kọrint 10:31
Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.
Gụọ isi ahụ dum: 1 Ndị Kọrint 10
N’ọnọdụ ya
28Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche.
29Akọnuche nke m na-ekwu maka ya abụghị nke gị, kama ọ bụ maka nke onye ahụ. Nʼihi gịnị ka mnwere onwe m ga-eji bụrụ ihe akọnuche onye ọzọ ga-ekpe ikpe?
30Ọ bụrụ na m nwere ike inye ekele, were nri m rie, olee otu e si ekwutọ m nʼihi ihe ahụ m nyere Chineke ekele banyere ya?
31Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.
32Unu emejọla ndị Juu maọbụ ndị Griik, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke.
33Na-agbalịsinụ ike ime dịka m si eme. Nʼihe ọbụla m na-eme, ana m ejisi ike ime ihe ga-atọ onye ọbụla ụtọ. Anaghị m achọ ọdịmma nke m naanị, kama ọ bụ ọdịmma nke mmadụ ibe m, ime ka a zọpụta ha.
N’asụsụ Bekee
So whether you eat or drink or whatever you do, do it all to the glory of God.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.Unu na ezinaụlọ unu ga-anọkwa nʼebe ahụ, nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu, rie oriri unu. Nʼihu ya kwa ka unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, nʼihi ihe niile ahụ unu setịpụrụ aka unu ime, na nʼihi ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu gọziri unu.Kama unu ga-eri ha nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara.“Gwanụ ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a, ‘Mgbe unu na-ebu ọnụ nʼọnwa nke ise ọbụla, na nʼọnwa nke asaa ọbụla, iri afọ asaa ndị a niile gara aga, ọ bụ mụ ka unu na-eburu ọnụ? Mgbe unu na-eri na-aṅụkwa, ọ bụ na unu anaghị eme ya maka nʼihi onwe unu?Unu na ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị bi nʼobodo unu, ndị na-enweghị ihe nketa nke aka ha, ga-anọ nʼebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.Kama werenụ ihe ndị ahụ dị nʼime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara unu ọcha.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike