Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Aịzaya 41:10
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Aịzaya 41:10
Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
N’ọnọdụ ya
7Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume. Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ, na-agba onye na-akụ osiama ume. Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.” Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda.
8“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m, Jekọb, onye m họpụtara, gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m.
9Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu, gwa unu na ohu m ka unu bụ, nʼihi na ahọpụtala m unu, agakwaghị m ahapụ unu.
10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
11“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere, ihere ga-emekwa ha. Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu, bụrụ ndị lara nʼiyi.
12Unu ga-ele anya ha, chọọ ha, ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ. Ndị a na-ebuso unu agha ga-abụ naanị ihe efu.
13Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’
N’asụsụ Bekee
Do not fear, for I am with you; do not be afraid, for I am your God. I will strengthen you; I will surely help you; I will uphold you with My right hand of righteousness.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.”Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ onye kere gị, Jekọb, na onye kpụrụ gị Izrel, “Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị. Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m. Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe, aga m anọnyere gị. Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo, agaghị m ekwe ka o bufuo gị. Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ, ọ gaghị eregbu gị. Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị?Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu.” Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Joshua, gwa ya okwu nʼihu ụmụ Izrel, sị ya, “Dị ike! Nwee obi ike! Nʼihi na ọ bụ gị ga-edu ndị a baa nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi inye nna nna ha, ị ga-emekwa ka ha keta ala a dịka ihe nketa ha. Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba.”Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume. Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m.Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’ Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb, unu Izrel dị nta, atụla egwu, nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike