Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 16:17

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Rom 16:17

Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Rom 16

N’ọnọdụ ya

14Ana m ekele unu Asinkritọs, Flegọn, Hamis, Patrobas, Hamis na ụmụnna anyị niile ndị ha na ha nọ.

15Keleerenụ m Filologọs, Juliya, Nerus na nwanne ya nwanyị. Keleekwanụ Olimpas na ndị nsọ niile ha na ha nọ.

16Werenụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịta onwe unu. Nzukọ Kraịst niile nọ nʼebe a na-ekelekwa unu.

17Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu.

18Ndị dị otu a abụghị ndị ozi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ naanị nʼihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike.

19Mmadụ niile anụla maka nrube isi unu na-erubere oziọma ahụ. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi unu. Achọrọ m ka unu bụrụ ndị maara ihe banyere ezi ihe, ka unu bụrụ ndị na-amaghị ihe nʼihe banyere ihe ọjọọ.

20Mgbe na-adịghị anya, Chineke nke udo ga-azọpịa ekwensu nʼokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.

Ndị Rom 16

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleRomans 16:17Now I urge you, brothers, to watch out for those who create divisions and obstacles that are contrary to the teaching you have learned. Turn away from them.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jud 1:19Ọ bụ ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ nʼime ha, bụ ndị na-eweta nkewa nʼetiti unu.”
2Te 3:6Ụmụnna, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu zere onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye kwere ekwe nʼime unu na-ebi ndụ umengwụ na onye na-adịghị eso ozizi nke unu natara nʼaka anyị.
1Tm 6:3–5Onye ọbụla na-ezi ihe ọzọ nke na-adabaghị nʼokwu ezi ntọala na-enye ndụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na ozizi nke ibi ndụ kwesiri onye nke Chineke, bụ onye nganga na-afụli elu, ma bụrụkwa onye na-amaghị ihe. Ọchịchọ obi ya bụ nke na-ezighị ezi ma jupụtakwa nʼịrụ ụka na ekworo nke na-eweta ịkpọ asị na esemokwu, na nkwulu nakwa ajọ echiche, na isi ịrụ ụka niile nke na-esite nʼaka ụmụ mmadụ ndị echiche ha na-enweghịkwa eziokwu. Ha na-eche na ife Chineke bụ ụzọ e si aba ọgaranya.
2Tm 3:5Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke Chineke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ.
Kọl 2:8Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iji ozizi na amamihe efu niile nke na-achị ụwa, na aghụghọ duhie unu nʼokwukwe. Okwu amamihe ahụ nke ihe ozizi ya na ọsịsa ya niile dabeere na mmụọ nke ụwa na ntụpụta mmadụ kama ịdabere nʼihe Kraịst kwuru.
Taị 3:10Gbasara onye na-akpa oke, ị dụchaa ya ọdụ ihe dịka otu ugboro maọbụ abụọ, leghara ya anya.
2Jọn 1:7–11Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst. Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju. Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi Kraịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere Nna na Ọkpara ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa izi unu ihe ọzọ dị iche site nʼozizi a, unu akpọbatala ya nʼụlọ unu, maọbụ nabatakwa ya. Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya.
2Te 3:14–15Ma ọ bụrụ na ndị ọbụla adịghị erube isi nye ihe anyị kwuru nʼime akwụkwọ ozi a, hụbanụ ndị dị otu a ama ma kwụsịkwa iso ha nwekọ ihe ọbụla, ka ihere mekwa ha. Nʼagbanyeghị nke a, unu agụkwala ha dị ka ndị iro unu, kama nyenụ ha ndụmọdụ dị ka ụmụnna.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike