Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 8:28

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Rom 8:28

Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Rom 8

N’ọnọdụ ya

25Ma ọ bụrụ na olileanya anyị dabeere nʼihe ahụ anyị na-enwetabeghị, anyị ga-eji ndidi chere tutu ihe ahụ erute anyị aka.

26Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ.

27Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ.

28Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị.

29Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna.

30Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto.

31Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị?

Ndị Rom 8

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleRomans 8:28And we know that God works all things together for the good of those who love Him, who are called according to His purpose.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 5:10Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi.
Jem 1:12Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.
Jen 50:20Ọ bụ ezie na unu chere ime m ihe ọjọọ, ma Chineke chere ya ka ọ bụrụ ezi ihe, iji debe ọtụtụ ndụ dịka ọ na-eme taa.
Rom 5:3–5Ọ bụkwaghị naanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime nsogbu anyị niile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachiobi. Ntachiobi na-arụpụta nʼime anyị ezi agwa; ezi agwa na-arụpụtakwa olileanya. Olileanya na-eme ka anyị guzo chịm, nʼihi na Chineke awụnyela ịhụnanya ya nʼime obi anyị site nʼonyinye Mmụọ Nsọ.
1Kọ 2:9Ma dịka e dere ya, “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”
Rom 8:35–39Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ mkpagbu. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha? Dịka e dere ya, “Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.” Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya. Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
Jem 1:3–4Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto. Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike