Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 12:2

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Rom 12:2

Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Rom 12

N’ọnọdụ ya

1Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.

2Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.

3Dịka onyinye amara e nyere m siri dị, ana m adọ onye ọbụla nʼime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nʼechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesi. Kama, jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dịka okwukwe Chineke nyere unu ha.

4Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche,

5nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị.

Ndị Rom 12

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleRomans 12:2Do not be conformed to this world, but be transformed by the renewing of your mind. Then you will be able to test and approve what is the good, pleasing, and perfect will of God.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 1:14Dị ka ụmụ na-erube isi, unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nʼọchịchịrị, na-achị ndụ unu.
Efe 4:22–24Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile, ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ. Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.
2Kọ 5:17Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.
Kọl 3:10Ugbu a, unu eyikwasịla ndụ ọhụrụ ahụ, nke e ji amamihe na-eme ka ọ dị ọhụrụ nʼoyiyi nke onye kere ya.
1Jọn 2:15–17Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya. Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa. Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Efe 5:17Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee,
Izk 36:26Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ.
1Pt 4:2Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike