Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ọpụpụ 20:13

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ọpụpụ 20:13

Gị egbula mmadụ.

Gụọ isi ahụ dum: Ọpụpụ 20

N’ọnọdụ ya

10Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọbụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị.

11Nʼihi na ọ bụ nʼime ụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. O zuru ike nʼụbọchị nke asaa. Nʼihi nke a Onyenwe anyị gọziri ụbọchị nke asaa doo ya nsọ, ka ọ bụrụ ụbọchị izuike.

12Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

13Gị egbula mmadụ.

14Gị akwala iko.

15Gị ezula ohi.

16Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị.

Ọpụpụ 20

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleExodus 20:13You shall not murder.

E hotara ya n’Agba Ọhụrụ

Mat 5:21“Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’
Mat 19:18Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara ya, “ ‘Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha.
Mak 10:19Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’ ”
Luk 18:20Ị maara ihe niile enyere nʼiwu, akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị. ”
Rom 13:9Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,” nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.”
Jem 2:11Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Dit 5:17Gị egbula mmadụ.
Jen 9:5–6Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya. “Onye ọbụla wufuru ọbara mmadụ, nʼaka mmadụ ka a ga-awụfu ọbara nke ya, nʼihi nʼoyiyi Chineke ka Chineke mere mmadụ.
Ọpụ 21:14Ọ bụrụkwa na onye ọbụla akpachara anya jiri aghụghọ gbuo mmadụ ibe ya, a ga-adọpụta ya, ọ bụladị site nʼebe ịchụ aja m, gbuo ya.
Mat 5:21–22“Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’ Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘ Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike