Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 6:23
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Rom 6:23
Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.
N’ọnọdụ ya
20Mgbe unu bụ ohu mmehie, o nweghị ihe megidere unu ime ezi omume.
21Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ.
22Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi.
23Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.
N’asụsụ Bekee
For the wages of sin is death, but the gift of God is eternal life in Christ Jesus our Lord.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.”Dịka o siri dị, ọ bụ site nʼaka otu nwoke ka mmehie siri bata nʼụwa. Ọ bụkwa mmehie a wetara ọnwụ. Ugbu a, ọnwụ erutela onye ọbụla aka nʼihi na mmadụ niile emehiela.Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ.Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.”Onye ahụ mere mmehie bụ onye ga-anwụ. Nwa agaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nna ya metara, nna agakwaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nwa ya metara. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ezi omume o mere, ma onye ajọ omume ga-anata ụgwọ nʼihi ajọ ihe o mere.“Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ.Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike