Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 12:19

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Rom 12:19

Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Rom 12

N’ọnọdụ ya

16Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile.

17Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Kama, na-echenụ otu unu ga-esi mee ihe dị mma nʼanya mmadụ niile.

18Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo.

19Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru.

20Ma otu ọ dị, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ, mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.”

21Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.

Ndị Rom 12

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleRomans 12:19Do not avenge yourselves, beloved, but leave room for God’s wrath. For it is written: “Vengeance is Mine; I will repay, says the Lord.”

Ihe e hotara n’Agba Ochie

Dit 32:35Ọ bụ m ka ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi. Mgbe oge ruru ụkwụ ha ga-agbuchapụ, ụbọchị mbibi ha na-abịa nso, ịla nʼiyi ha chị ọsọ na-abịakwasị ha.”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Hib 10:30Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”
Ilu 24:29Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.”
Ilu 20:22A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.” Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.
1Te 4:6Ka onye ọbụla ghara imegbu maọbụ ịghọgbu nwanna ya nʼokwu a. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ, na-adọsikwa unu aka na ntị ike.
Rom 12:14Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ.
Lev 19:18“ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike