Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ilu 22:6

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ilu 22:6

Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi, mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.

Gụọ isi ahụ dum: Ilu 22

N’ọnọdụ ya

3Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya, ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.

4Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.

5Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu; ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ.

6Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi, mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.

7Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.

8Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.

9Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.

Ilu 22

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleProverbs 22:6Train up a child in the way he should go, and when he is old he will not depart from it.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Efe 6:4Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
Dit 6:7Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
2Tm 3:15Ị maara na ọ bụ site nʼoge ị bụ nwantakịrị ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri doo gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site nʼokwukwe i nwere nʼime Kraịst Jisọs.
Jen 18:19Nʼihi na ahọpụtala m ya, ka ọ tụziere ụmụ ya na ụlọ ya ndị ga-esote ya ịgbaso ụzọ Onyenwe anyị site nʼime ihe dị mma na ihe ziri ezi, ka Onyenwe anyị mezuoro Ebraham ihe niile o kwere ya na nkwa.”
Dit 4:9Naanị kpachapụnụ anya unu, ma cheenụ onwe unu nche mgbe niile, ka unu ghara ichefu ihe ndị a niile unu ji anya unu hụ, ka ha gharakwa isi nʼobi unu pụọ ụbọchị niile nke ndụ unu. Kama kuziere ha ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ndị ga-esote ha.
Abụ 78:3–6ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị. Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere. O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha, ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
1Sa 1:28Ma ugbu a, ana m enyeghachi ya Onyenwe anyị ka ọ bụrụ nke ya ndụ ya niile.” O fere Onyenwe anyị ofufe nʼebe ahụ.
1Sa 2:26Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị Onyenwe anyị na mmadụ mma.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike