Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Hibru 13:4

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Hibru 13:4

Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Hibru 13

N’ọnọdụ ya

1Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide.

2Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.

3Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu.

4Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.

5Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”

6Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”

7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.

Ndị Hibru 13

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleHebrews 13:4Marriage should be honored by all and the marriage bed kept undefiled, for God will judge the sexually immoral and adulterers.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jen 2:24Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
Gal 5:19Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko.
Jen 1:27–28Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha. Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.”
1Kọ 6:9Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,
Gal 5:21Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.
1Kọ 5:13Chineke ga-ekpe ndị nọ nʼezi ikpe. “Chụpụnụ onye ajọọ mmadụ ahụ site nʼetiti unu.”
Kọl 3:5–6Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị). Ọ bụkwa nʼihi ihe ndị a ka ọnụma Chineke na-abịakwasị ndị ahụ na-enupu isi.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike