Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Luk 10:38–42
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Luk 10:38–42
38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya.
39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu.
40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.”
41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe,
42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.”
N’ọnọdụ ya
35Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.’
36“Onye nʼime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbataobi nye nwoke ahụ nke dabara nʼaka ndị ohi?”
37Ọ sịrị, “Ọ bụ onye ahụ meere ya ebere.” Jisọs sịrị ya, “Laa, gaa mee otu ahụ.”
38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya.
39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu.
40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.”
41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe,
42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.”
N’asụsụ Bekee
As they traveled along, Jesus entered a village where a woman named Martha welcomed Him into her home. She had a sister named Mary, who sat at the Lord’s feet listening to His message. But Martha was distracted by all the preparations to be made. She came to Jesus and said, “Lord, do You not care that my sister has left me to serve alone? Tell her to help me!” “Martha, Martha,” the Lord replied, “you are worried and upset about many things. But only one thing is necessary. Mary has chosen the good portion, and it will not be taken away from her.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza. Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma; nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m. Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m.Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.”Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ.ma nchekasị nke ndụ a, na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike