Bible Explorer

Ụlọ › Ihe Baịbụl kwuru › Ịzụ ụmụaka

Mmekọrịta

Ihe Baịbụl kwuru banyere Ịzụ ụmụaka

Amaokwu ndị na-agụ ya na-elekarị anya maka isiokwu a (12), e hotara ha nʼuju site na Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a.

Ilu 22:6Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi, mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
Efe 6:4Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
1Tm 5:8Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ.
Abụ 127:3Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị, ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
Ilu 13:24Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya; ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.
Ilu 29:15Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa, ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.
Ilu 29:17Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ. Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
Kọl 3:21Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.
Dit 6:6–7Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi. Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
Ilu 1:8–9Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị. Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
Ilu 19:18Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị. Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.
Ilu 15:5Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu; ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.

Ndị a bụ amaokwu ndị na-agụ na-achọkarị maka isiokwu a — ọ bụghị nkuzi banyere ya. Gụọ nke ọ bụla n'isiakwụkwọ ya.

Isi mmalite

Amaokwu nke isiokwu ọ bụla na usoro ha: data isiokwu nke OpenBible.info, dịka votu ndị na-agụ ya si dị: OpenBible.info · CC BY 4.0

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.