Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Filipai 4:6–7

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Filipai 4:6–7

6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.

7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Filipai 4

N’ọnọdụ ya

3E, ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, biko, nyere ụmụ nwanyị ndị a aka nʼihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa oziọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ.

4Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ!

5Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.

6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.

7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.

8Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya.

9Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.

10Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya.

Ndị Filipai 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BiblePhilippians 4:6–7Be anxious for nothing, but in everything, by prayer and petition, with thanksgiving, present your requests to God. And the peace of God, which surpasses all understanding, will guard your hearts and your minds in Christ Jesus.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 3:5–6Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị. Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
1Pt 5:7Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
Abụ 55:22Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, ọ ga-agba gị ume; ọ gaghị ekwe ka ewezuga onye ezi omume.
1Te 5:17–18Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka. Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.
Mat 7:7–8“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.
Abụ 34:5–7Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha.
Mat 6:8Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu.
Jọn 14:27Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike