Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Filipai 4:13

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Filipai 4:13

Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Filipai 4

N’ọnọdụ ya

10Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya.

11Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla.

12Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ.

13Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.

14Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya.

15Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu.

16Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m.

Ndị Filipai 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BiblePhilippians 4:13I can do all things through Christ who gives me strength.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Aịz 41:10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
2Kọ 12:9–10Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m. Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.
Efe 6:10Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu.
Kọl 1:11Ebe a na-eme ka unu dị ike nʼime ike niile, dị ka ike nke ebube ya si dị. Ka unu nwee ndidi na ogologo ntachiobi,
Aịz 40:29–31Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume. Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Efe 3:16Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu;
Jọn 15:7Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.
2Kọ 3:4–5Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ. Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike