Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 5:16

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 5:16

Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 5

N’ọnọdụ ya

13“Unu bụ nnu nke ụwa, ma ọ bụrụ na nnu adịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ọ bakwaghị uru ọbụla, ma ọ bụghị naanị itufu ya, ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ.

14“Unu bụ ihe nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nʼelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo.

15Ndị mmadụ adịghị amụnye oriọna dọnye ya nʼokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba oriọna, ka o nye ndị niile nọ nʼụlọ ahụ ìhè.

16Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe.

17“Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha.

18Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu.

19Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.

Matiu 5

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 5:16In the same way, let your light shine before men, that they may see your good deeds and glorify your Father in heaven.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 2:12Bienụ ezi ndụ nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ọ ga-abụ na a sị na ha ebo unu ebubo ime ihe ọjọọ, ha ga-ahụ ọrụ ọma unu, ma nye Chineke otuto nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa.
Taị 2:7Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi.
Jọn 15:8Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.
1Jọn 1:5–7Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya. Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị. Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile.
Fil 2:15–16Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nʼime ụwa ọjọọ a, nʼetiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, na nʼetiti ndị nwere obi nʼazụ. Mgbe ahụ, unu ga-enwupụta nʼetiti ha dị ka kpakpando nʼime ụwa! Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu.
Efe 5:8Nʼihi nʼoge gara aga, unu bụ ọchịchịrị, ma ugbu a, unu bụ ìhè nʼime Onyenwe anyị. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ìhè
Aịz 60:1–3“Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala, ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ. Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile, oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa, ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ. Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.
1Pt 3:16Ma na-enwenụ akọnuche dị ọcha, ka ndị ahụ na-ekwulu ibi obi ọma unu nʼime Kraịst, bụrụ ndị ihere ga-eme banyere nkwutọ ha na-ekwutọ unu.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike