Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 6:14–15
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Matiu 6:14–15
14Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu.
15Ọ bụrụkwanụ na unu agbagharaghị ndị ọzọ mmehie niile ha, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.
N’ọnọdụ ya
11Nye anyị nri nke ụbọchị taa.
12Gbaghara anyị mmehie anyị, dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị.
13Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa, kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’
14Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu.
15Ọ bụrụkwanụ na unu agbagharaghị ndị ọzọ mmehie niile ha, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.
16“Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha.
17Mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri,
18ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ.
N’asụsụ Bekee
For if you forgive men their trespasses, your heavenly Father will also forgive you. But if you do not forgive men their trespasses, neither will your Father forgive yours.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu.Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu.Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu.“Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.”Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya.Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye, ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike