Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 5:28

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 5:28

Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 5

N’ọnọdụ ya

25“Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.

26Nʼezie, agwa m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri kobo niile i ji.

27“Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Akwala iko.’

28Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ.

29Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ.

30Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ.

31“E kwukwara sị, ‘Onye ọbụla chọrọ ịgbara nwunye ya alụkwaghị m, ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya.’

Matiu 5

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 5:28But I tell you that anyone who looks at a woman to lust after her has already committed adultery with her in his heart.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Jọn 2:16Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.
Jem 1:14–15Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya. Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ.
Ilu 6:25Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị.
Ọpụ 20:17Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”
2Sa 11:2Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya.
Job 31:1“Mụ na anya m gbara ndụ kpebie na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike